Next Stop…Nigeria (written in IGBO)

The Giant of Africa: Nigeria and its Influence on Fashion

Obodo nke na esote Benin, itinyere Chad na Cameroon n’ebe ọwụwa anyanwụ, Nigeria aghọwo ihe abụrụ zuru ụwa ọnụ ike. Obodo nke a nwere mmasi, nke amara maka onye odee Chinua Achebe, Nollywood, na ọrụ na mmepe nke egwu nkwa Africa, bukwa nke ana etu Oke Mmanwu nke Africa, n’ihi na ndi ọtụtụ mba bi na ya,owere na-eto eto aku na uba. Na-oge adịbeghị anya, obodo a enwetela nnukwu aku n’uba, nke mere ka ana ahuta ya dika otu abụrụ zuru ụwa ọnụ ike. Edepụtara Nigeria dịka obodo nke iri abụọ kasị ukwuu na aku na uba (GDP) dị ka ya aku na uba, dabere na ego, na nkà na ụzụ na ọrụ, na-eme nke ọma.
Mr. Eke wearing an African print outfit called Dashiki

Na ihi aku na uba na nkwụsi ike nke obodo ha ugbua, ụmụ afọ Nigeria na-etinye uche na ego na ihe gbasara ejiji karia. Ochicho iyi ejiji na ewu ewu na ewelitekwa isi,ọ bụghị naanị ndị ọgaranya , ma ndị na-eto eto. Ndi otu anyi kpotụrụ Maazị Chibueze Eke, otu nwa amadi ihe ejiji doro anya nke oma,
were kparita ụka banyere ụfodu ndi na akwalite ihe gbasara ejiji na-ala Nigeria (Noble Igwe, Toke Makinwa), nakwa ihe gbanyere uwe Agbada, nke na ewu ewu ugbua. Anyị tụlekwara banyere udi akwa na ejiji nke na ewu ewu ugbua na-ala Nigeria.
Your Questions

#1. Kedu otú ejiji gbanwere na Nigeria n’ime afọ iri abụọ na ise gara-aga?

Kosi, Makuo and Emypee wearing Agbada
  • Ejiji agbanweela na Nigeria n’ime afọ iri abụọ na ise gara aga. N’ihi imetụta si na obodo ndi ocha, ndi mmadu anakwaghi eyi uwe mwuda maọbu uwe gbasara agbasa,kama, ha na eyizi uwe na atakpa mmadu na ahu. Ọzọkwa,ndi mmadu anaghikwa asọzi ihere na iyiputa akwa na egosi ọtutu akuku ahu ha, site na elu akwa na egosi afọ, na akwa agbadaghi nwanyi ọfuma, nakwa uwe dọkara adọka. Akwa mgbe ochie na alachitekwa azu iwu ọzọ ugbua na etiti ndi na eto eto.

#2. Kedu ndị bụ ndị ụfọdụ n’ime ndị kasị emetuta ihe gbasara ejiji na Nigeria ? Ọ bụ nanị ndị mba ọzọ dị ka Italy ma ọ bụ America, ka onwere ndi amụrụ na obodo gị na emetuta ihe gbasara ejiji na eyimeyi?

Model wearing Agbada
  • Udi ejiji ndi America na enwe nnukwu mmetụta na otu ndi obodo Nigeria si akwado na ejiji nke ha. Anyị na-achota oyiri oyu anyi si akwadobe na magazin dị ka Vogue na GQ . N’agbanyeghị , e nwere ndị ụfọdụ umu-afọ Nigeria na eyi ihe ndị dị iche iche eji mara naani ha. N’ihi ntoputa nke ndi na emepụta ejiji, otutu ndi welitere isi na obodo na eweputa njirimara ejiji nke ha onwe ha. Ụfọdụ n’ime ndi a na-agụnye Noble Igwe, Toke Makinwa, Dbanj, Ik Ogbonna, Toni Tones, Temi Dollface, wdg.

Ndi na eto na-eso ndị a na Instagram maka na uwe na-ewu ewu, nakwa imuta otu esi eyi uwe.

#3. Kedu ụfọdụ n’ime ejiji ndị na-ewu ewu ugbu a na Nigeria?

  •  Otu n’ime ejiji na ewu-ewu ugbu a bụ uwe Agbada. E nwere nke ndị ikom nakwa ndị inyom. Uwe jeans nakwa akpụkpọ ụkwụ brogues na ewukwa ewu na etiti ndi na-eto eto. Ịtụle na akwa ndi mgbe ochie na alachite iwukwa ewu ọzọ ugbu a, otutu ndi mmadu na eyi otutu akwa ndi, di ka okpu Fedora, akwa vintej dgz.

 

#4. Ndị ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ ana-azuta akwa akwachagoro akwa, ka ha ana-eji aka ha akwa uwe ha na eyi?

Model Nene wearing Kimono

 

  •  Ndi na-eto eto na aka akwado ịzụ uwe ha azụ na Nigeria n’ụzọ dị ukwuu n’ihi na ndi na emepụta ejiji na aka onwe ha dị oké ọnụ. Odi onu ala karia igote uwe akwachagoro, karia ije kwawa otu isi were choo, kama ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị welitere isi na aku na uba na eje na nke ndi na emeputa ejiji maka uwe nke masiri ahu ha.

#5. Achọpụtara m na ọna-amasị ndị inyom na ụmụ agbọghọ ndị obodo unu iyi akwa na egbuke-egbuke karịa nnọọ ná mba ndị ọzọ. Ọ bụ eziokwu na gịnị kpatara ya?

  •  Ona amasi ndi ama ama na obodo Nigeria ikwuputa iche ka amara ma hutakwa na ha biara. Nke a mere ona amasi ha iyi ejiji na uwe na egbuke egbuke mgbe niile. Ihe bu isi dokpu nti na ime nke a bu ka ahuchata ha, onweghi ihe ọzọ.

Many thanks to Mr. Chibueze Eke for his work and translation. 

Leave a Reply